8 Jụọ ụmụ okorobịa gị, ha ga-agwakwa gị, ka ụmụ okorobịa m nweta ihu ọma gị, n’ihi na ọ bụ n’ụbọchị ọma ka anyị bịara. Biko, nyetụ ndị ohu gị nakwa nwa gị Devid ihe ọ bụla aka gị ruru.’”+
14 Ma Ịlaịsha+ dara ọrịa, bụ́ ọrịa ga-egbu ya.+ Jehoash bụ́ eze Izrel wee gbadakwuru ya ma malite ịkwa ákwá n’ihu ya, sị: “Nna m,+ nna m, ụgbọ ịnyịnya agha Izrel na ndị na-agba ịnyịnya ya!”+