45 “Nkọcha ndị a niile+ ga-abịakwasịkwa gị, chụọ gị ọsọ ma chụkwute gị ruo mgbe a lara gị n’iyi,+ n’ihi na i geghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị site n’idebe iwu ya na ụkpụrụ ya ndị o nyere gị.+
63 “Ọ ga-erukwa na dị nnọọ ka Jehova nwere aṅụrị n’ihi unu imere unu ihe ọma na ime ka unu mụbaa,+ otú ahụ ka Jehova ga-enwe aṅụrị n’ihi unu ibibi unu na ịla unu n’iyi;+ a ga-efopụkwa unu n’ala ahụ ị na-aga inweta.+
16 Ọ bụ mgbe ahụ ka Menahem bibiri Tifsa na ihe niile dị n’ime ya na ókèala ya malite na Teza gawa, n’ihi na o megheghị ụzọ, o wee bibie ya. Ọ bọwakwara ndị inyom ya niile dị ime afọ.+
14 E nwewo ọgba aghara n’etiti ndị gị,+ a ga-ebukọrọ ihe niile dị n’obodo gị ndị e wusiri ike+ otú ahụ Shalman bukọọrọ n’ụlọ Abel, n’ụbọchị agha, mgbe a kụriri otu nwaanyị na ụmụ ya.+