7 Ma Jehova sịrị Samuel: “Elela anya n’ọdịdị ya na ogo ya,+ n’ihi na ajụwo m ya. N’ihi na ọ bụghị otú mmadụ si ahụ ihe ka Chineke si ahụ,+ n’ihi na mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ;+ ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.”+
17 Chineke m, amaara m nke ọma na ị bụ onye na-enyocha obi,+ nakwa na ịkwụwa aka ọtọ na-atọ gị ụtọ.+ Mụ onwe m ji obi ziri ezi nye ihe ndị a niile n’afọ ofufo, obi dịkwa m ụtọ ịhụ ndị gị bịara ebe a ka ha na-enye gị onyinye n’afọ ofufo.
23 M ga-ejikwa ihe otiti na-akpata ọnwụ gbuo ụmụ ya, ka ọgbakọ niile wee mara na ọ bụ m na-enyocha akụrụ na obi, m ga-akwụkwa unu ụgwọ n’otu n’otu dị ka omume unu si dị.+