8 Ókè ya gbagokwara ndagwurugwu nwa Hinọm,+ ruo ná mkpọda nke obodo ndị Jibọs+ nke dị na ndịda, ya bụ, Jeruselem;+ ókè ya gbagoro n’elu ugwu nke chere ihu na ndagwurugwu Hinọm n’ebe ọdịda anyanwụ, nke dị na nsọtụ ndagwurugwu Refeyim+ n’ebe ugwu.
5 Ọ ga-erukwa na mgbe onye na-ewe ihe ubi ga na-achịkọta ọka* kwụ ọtọ, mgbe o jikwa aka ya na-ewekọta oko ọka,+ ọ ga-adị ka onye na-atụtụkọta oko ọka e wefọrọ n’ubi na ndagwurugwu Refeyim.+