6 O wee gaa n’ihu ịsị: “Abụ m Chineke nke nna gị, Chineke Ebreham, Chineke Aịzik na Chineke Jekọb.”+ Mozis wee wepụ ihu ya, n’ihi na egwu tụrụ ya ile ezi Chineke anya.
33 Ihe kpatara ya bụ na ha ahapụwo m+ ma malite ịkpọrọ Ashtọret+ bụ́ chi nwaanyị ndị Saịdọn isiala, tinyere Kimọsh+ bụ́ chi Moab na Milkọm+ bụ́ chi ụmụ Amọn; ha ejeghịkwa ije n’ụzọ m site n’ime ihe ziri ezi n’anya m na idebe ụkpụrụ m na mkpebi ikpe m dị ka Devid nna ya.
2 O wee gakwuru Esa sị ya: “Geenụ m ntị, Esa na Juda na Benjamin dum! Jehova ga-anọnyere unu ma ọ bụrụhaala na unu adịnyere ya;+ ọ bụrụ na unu achọọ+ ya, ọ ga-ekwe ka unu chọta ya, ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya, ọ ga-ahapụ unu.+
13 ‘n’ihi na ndị m mere ihe abụọ dị njọ: Ha ahapụwo mụ onwe m,+ bụ́ isi iyi nke mmiri na-enye ndụ,+ ka ha wee gwuoro onwe ha olulu, olulu gbawara agbawa, ndị na-apụghị ichedo mmiri.’