11 “Ebe ọ bụ na Manase+ eze Juda emewo ihe arụ+ ndị a, o mewo ihe ọjọọ karịa ihe niile ndị Amọraịt+ mere, bụ́ ndị biri n’ebe ahụ tupu ya onwe ya, o wee jiri arụsị ya ndị na-asọ oyi ka nsị mee ka ọbụna Juda mehie.+
20 “‘Otú ọ dị, ihe na-adịghị mma i mere bụ na ị gbachiri nwaanyị ahụ bụ́ Jezibel nkịtị,+ bụ́ onye na-akpọ onwe ya onye amụma, ọ na-akụzikwara+ ndị ohu m,+ na-eduhiekwa ha, ka ha na-akwa iko,+ ka ha na-erikwa ihe e ji chụọrọ arụsị àjà.+