2 Ihe E Mere 7:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Anya m+ ga-eghere oghe, ntị m+ ga-anụkwa ekpere e kpere n’ebe a. 2 Ihe E Mere 16:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 N’ihi na anya+ Jehova na-ahụzu ụwa dum+ iji gosi ike ya maka ndị obi ha+ zuru ezu n’ebe ọ nọ. I zuzuru nzuzu+ n’ihe a i mere, n’ihi ya, malite ugbu a gaa n’ihu, a ga na-ebuso gị agha.”+ Abụ Ọma 11:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya.+Jehova—n’eluigwe ka ocheeze ya dị.+Anya ya na-ahụ, anya ya nke na-enwu gbaa na-enyocha+ ụmụ mmadụ. Abụ Ọma 34:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Anya Jehova dị n’ebe ndị ezi omume nọ,+Ntị ya dịkwa ná mkpu enyemaka ha na-eti.+ Aịzaya 37:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Jehova, biko, tọọ ntị n’ala nụrụ.+ Jehova, biko, meghee anya gị+ hụrụ, nụrụkwa ihe niile Senakerib kwuru,+ nke o zitere iji kwaa Chineke dị ndụ emo.+
9 N’ihi na anya+ Jehova na-ahụzu ụwa dum+ iji gosi ike ya maka ndị obi ha+ zuru ezu n’ebe ọ nọ. I zuzuru nzuzu+ n’ihe a i mere, n’ihi ya, malite ugbu a gaa n’ihu, a ga na-ebuso gị agha.”+
4 Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya.+Jehova—n’eluigwe ka ocheeze ya dị.+Anya ya na-ahụ, anya ya nke na-enwu gbaa na-enyocha+ ụmụ mmadụ.
17 Jehova, biko, tọọ ntị n’ala nụrụ.+ Jehova, biko, meghee anya gị+ hụrụ, nụrụkwa ihe niile Senakerib kwuru,+ nke o zitere iji kwaa Chineke dị ndụ emo.+