14 Absalọm na ndị ikom niile nke Izrel wee sị: “Ndụmọdụ Hushaị onye Akaịt ka ndụmọdụ Ahitofel mma!”+ Jehova n’onwe ya enyewo iwu+ iji mebie ndụmọdụ+ Ahitofel, ọ bụ ezie na ọ dị mma,+ ka Jehova wee mee ka ọdachi+ dakwasị Absalọm.
10 Maranụ na ọ dịghị ihe ọ bụla dị n’okwu Jehova nke Jehova kwuru ga-eme ụlọ Ehab+ ga-ada n’ala n’emezughị;+ Jehova emewokwa ihe o kwuru site n’ọnụ ohu ya bụ́ Ịlaịja.”+
11 otú ahụ ka okwu m nke si n’ọnụ m pụta ga-adị.+ Ọ gaghị agba aka lọghachikwute m,+ kama ọ ga-eme ihe na-atọ m ụtọ,+ ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.+