11 Jehova, gị onwe gị nwe ịdị ukwuu+ na ike+ na ịma mma+ na ebube+ na nsọpụrụ;+ n’ihi na ihe niile dị n’eluigwe na n’elu ụwa bụ nke gị.+ Jehova, Onye na-emekwa onwe ya ka ọ dị elu dị ka onyeisi nke mmadụ niile,+ ọ bụ gị nwe alaeze.+
3 N’ihi na mụ onwe m bụ Jehova Chineke gị, Onye Nsọ Izrel, bụ́ Onye Nzọpụta gị.+ M nyewo Ijipt ka ọ bụrụ ihe mgbapụta gị,+ werekwa Itiopia+ na Siba gbanweta gị.
6 “Nke a bụ ihe Jehova, bụ́ Eze Izrel,+ Onye Mgbapụta ya,+ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru, ‘Abụ m onye mbụ, abụkwa m onye ikpeazụ,+ ọ dịghị Chineke ọzọ dịnụ ma e wezụga m.+