10 “Unu bụ ndị àmà m,”+ ka Jehova kwuru, “ọbụna ohu m nke m họọrọ,+ ka unu wee mara,+ nweekwa okwukwe n’ebe m nọ,+ ka unu wee ghọtakwa na abụ m otu Onye ahụ.+ Ọ dịghị Chi a kpụrụ tupu mụ onwe m,+ ọ dịghịkwa nke sochiri m.+
24 Nke a bụ ihe Jehova, bụ́ Onye Mgbapụta gị,+ na Onye kpụrụ gị n’afọ, kwuru: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova, na-eme ihe niile. Ọ bụ naanị m setịrị eluigwe,+ gbasaakwa ụwa.+ Ònye ka mụ na ya nọ?