5 “N’aka nke ọzọ, nke a bụ ihe unu ga-eme ha: Unu ga-akwatusị ebe ịchụàjà ha,+ unu ga-akụtusịkwa ogidi nsọ ha,+ unu ga-akwatusịkwa+ ogwe osisi ha dị nsọ,+ unu ga-akpọkwa ihe oyiyi ha a pịrị apị ọkụ.+
13 Ma ọ chụturu Meaka+ nne ya ochie ka ọ ghara ịbụkwa nnukwu nwaanyị,+ n’ihi na o meere ogwe osisi dị nsọ arụsị jọgburu onwe ya; e mesia, Esa gbuturu arụsị ya nke jọgburu onwe ya+ ma kpọọ ya ọkụ+ na ndagwurugwu Kidrọn.+