5 ọlaedo bụ maka ihe ndị a ga-eji ọlaedo rụọ, ọlaọcha maka ihe ndị a ga-eji ọlaọcha rụọ nakwa maka ọrụ niile ndị omenkà ga-arụ. Ònye n’ime unu na-ewepụta onwe ya iwetara Jehova onyinye taa?”+
70 E nwekwara ndị so ná ndị isi+ ọnụmara+ dị iche iche ndị nyere onyinye maka ọrụ ahụ.+ Tesheta+ nyere otu puku mkpụrụ ego drakma ọlaedo, ọkwá iri ise, uwe mwụda ndị nchụàjà+ narị ise na iri atọ, ka e debe ha n’ebe a na-edebe akụ̀.