24 Ị ga-eji ájá wuoro m ebe ịchụàjà,+ ị ga-achụkwa àjà nsure ọkụ gị na àjà udo gị, ìgwè atụrụ gị na ìgwè ehi gị,+ n’elu ya. N’ebe ọ bụla m ga-eme ka a na-echeta aha m ka m ga-abịakwute gị, m ga-agọzikwa gị.+
5 kama ọ bụ ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ n’ebo unu niile ime ka aha ya dịrị na ya, ime ka o biri na ya, ka unu ga-achọ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka unu ga-abịa.+