9 Ị makwaara nke ọma na Jehova bụ́ Chineke gị bụ ezi Chineke,+ Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi,+ onye na-edebere ndị hụrụ ya n’anya na ndị na-edebe ihe o nyere n’iwu ọgbụgba ndụ+ ya ma na-egosi ha obiọma* ruo otu puku ọgbọ,+
23 o wee gaa n’ihu ịsị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel,+ ọ dịghị Chi dị ka gị+ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, gị onye na-edebere ndị ohu+ gị ọgbụgba ndụ, bụ́ ndị ji obi ha dum na-eje ije n’ihu gị,+ gị onye na-egosikwa ha obiọma,*+
18 ka anyị, bụ́ ndị gbagaworo n’ebe mgbaba ahụ wee nwee agbamume siri ike iji jigide olileanya ahụ+ e debere n’ihu anyị, site n’ihe abụọ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe, bụ́ ndị ọ na-agaghị ekwe omume na Chineke ga-agha ụgha na ha.+