22 Ọ bụ ya mere i ji dị ukwuu n’ezie,+ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova; n’ihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ka gị,+ ọ dịghịkwa Chineke dịnụ ma e wezụga gị+ n’ime chi niile anyị jiworo ntị anyị nụ.
18 Olee Chi dị ka gị,+ onye na-agbaghara njehie, nke na-agbaghakwara mmebi iwu+ nke ndị fọdụrụ n’ihe nketa ya?+ Ọ gaghị na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na obiọma* na-atọ ya ụtọ.+