1 Ihe E Mere 29:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 N’ihi na n’ihu gị, anyị bụ ndị mbịarambịa na ndị ọbịa+ dịkwa ka ndị nna nna anyị niile. Ụbọchị ndụ anyị n’elu ụwa dị ka onyinyo,+ olileanya adịghịkwa. Abụ Ọma 102:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Ụbọchị m dị ka onyinyo mgbede,+Mụ onwe m akpọnwụwokwa dị ka ahịhịa efu.+ Abụ Ọma 144:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Mmadụ yiri ume efu e kupụrụ ekupụ;+Ụbọchị ya dị ka onyinyo nke na-agafe agafe.+ Ekliziastis 8:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Ma ọ gaghị adịrị onye ajọ omume mma ma ọlị,+ ọ gaghịkwa eme ka ụbọchị ndụ ya, nke dị ka onyinyo,+ dị ogologo, n’ihi na ọ dịghị atụ egwu Chineke.+
15 N’ihi na n’ihu gị, anyị bụ ndị mbịarambịa na ndị ọbịa+ dịkwa ka ndị nna nna anyị niile. Ụbọchị ndụ anyị n’elu ụwa dị ka onyinyo,+ olileanya adịghịkwa.
13 Ma ọ gaghị adịrị onye ajọ omume mma ma ọlị,+ ọ gaghịkwa eme ka ụbọchị ndụ ya, nke dị ka onyinyo,+ dị ogologo, n’ihi na ọ dịghị atụ egwu Chineke.+