Abụ Ọma 35:28 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 28 Ka ire m kwupụtakwa ezi omume gị n’olu dị ala,+Ka o kwupụta otuto gị ogologo ụbọchị dum.+ Abụ Ọma 51:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Chineke bụ́ Chineke nke nzọpụta m,+ biko, napụta m n’ikpe ọmụma ọbara,+Ka ire m wee jiri ọṅụ na-akọ banyere ezi omume gị.+ Abụ Ọma 71:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Ọnụ m ga-akọ ezi omume gị,+Kọọkwa nzọpụta gị ogologo ụbọchị dum,+N’ihi na amaghị m ole ha dị.+ Abụ Ọma 98:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Jehova emewo ka a mara nzọpụta ya;+O kpughewo ezi omume ya n’anya mba dị iche iche.+ Abụ Ọma 145:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Ha ga-ekwu okwu nke ukwuu banyere ịdị mma gị dị ukwuu,+Ha ga-etikwa mkpu ọṅụ n’ihi ezi omume gị.+
14 Chineke bụ́ Chineke nke nzọpụta m,+ biko, napụta m n’ikpe ọmụma ọbara,+Ka ire m wee jiri ọṅụ na-akọ banyere ezi omume gị.+