2 Ihe E Mere 33:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 O wee na-ekpeku ya ekpere, nke mere na ọ nabatara+ arịrịọ ya. O wee nụ arịrịọ ọ na-arịọ ka e meere ya amara. O wee mee ka ọ lọghachi Jeruselem, n’ọchịchị ya;+ Manase wee mara na Jehova bụ ezi Chineke.+ Abụ Ọma 22:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 N’ihi na ọ dịghị eleda mmekpa ahụ́ nke onye nọ n’ahụhụ anya,+Ọ dịghịkwa eleghara ya anya;+O wepụghịkwa ihu ya n’ebe ọ nọ,+Mgbe o tikuru ya maka enyemaka, ọ nụrụ.+ Abụ Ọma 119:58 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 58 Ejiriwo m obi m dum mee ka obi gị jụrụ.+Meere m amara dị ka i kwuru.+ Ilu 28:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma,+ ma onye na-ekwupụta ya ma na-ahapụ ya ka a ga-emere ebere.+ Luk 15:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 Ma nna ya sịrị ndị ohu ya, ‘Ngwa! chịpụtanụ uwe mwụda nke kasị mma, chịrịkwanụ ya yiwe ya,+ gbanyenụ ya ọla n’aka,+ yiwekwa ya akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ.
13 O wee na-ekpeku ya ekpere, nke mere na ọ nabatara+ arịrịọ ya. O wee nụ arịrịọ ọ na-arịọ ka e meere ya amara. O wee mee ka ọ lọghachi Jeruselem, n’ọchịchị ya;+ Manase wee mara na Jehova bụ ezi Chineke.+
24 N’ihi na ọ dịghị eleda mmekpa ahụ́ nke onye nọ n’ahụhụ anya,+Ọ dịghịkwa eleghara ya anya;+O wepụghịkwa ihu ya n’ebe ọ nọ,+Mgbe o tikuru ya maka enyemaka, ọ nụrụ.+
13 Onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma,+ ma onye na-ekwupụta ya ma na-ahapụ ya ka a ga-emere ebere.+
22 Ma nna ya sịrị ndị ohu ya, ‘Ngwa! chịpụtanụ uwe mwụda nke kasị mma, chịrịkwanụ ya yiwe ya,+ gbanyenụ ya ọla n’aka,+ yiwekwa ya akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ.