29 Chineke wee sị: “Lee, enyewo m unu ahịhịa ndụ niile na-amị mkpụrụ bụ́ ndị dị n’elu ala dum nakwa osisi ọ bụla nke na-amị mkpụrụ a na-akụ akụ.+ Ka ọ bụrụ ihe oriri unu.+
25 “N’ihi nke a, ana m asị unu: Kwụsịnụ ichegbu onwe unu+ banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi.+ Ọ̀ bụ na mkpụrụ obi adịghị mkpa karịa ihe oriri, ahụ́ ọ́ dịghịkwa mkpa karịa uwe?+
30 Ma ọ bụrụ na Chineke na-eyiwe ahịhịa ndụ dị n’ubi uwe, nke dị ebe a taa, ma echi, a tụba ya n’ekwú, ọ̀ bụ na ọ gaghị eyiwe unu uwe karị, unu ndị okwukwe nta?+
28 Ọ bụrụkwa na Chineke si otú a na-eyiwe ahịhịa ndụ dị n’ubi uwe, nke na-adị taa, ma echi, a tụba ya n’ekwú, lee ka ọ ga-esi yiwe unu uwe karị, unu ndị okwukwe nta!+
16 “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya+ nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya,+ ka e wee ghara ibibi+ onye ọ bụla nke nwere okwukwe+ na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.+
17 ọ bụ ezie na ọ hapụghị onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe o mere ihe ọma,+ na-enye unu mmiri ozuzo+ site n’eluigwe, na oge mkpụrụ ji amị, na-enyekwa unu nri n’ụba, na-emekwa ka unu nwee obi ụtọ.”+