9 M ga-etinye otu ụzọ n’ụzọ atọ ahụ n’ọkụ;+ m ga-anụcha ha dị ka e si anụcha ọlaọcha,+ nwaleekwa ha dị ka e si anwale ọlaedo.+ Ma, ha ga-akpọku aha m, m ga-azakwa ha.+ M ga-asị, ‘Ha bụ ndị m,’+ ha onwe ha ga-asịkwa, ‘Jehova bụ Chineke anyị.’”+
3 Ọ ga-anọdụkwa dị ka onye na-anụcha ihe na onye na-eme ka ọlaọcha dị ọcha,+ ọ ga-emekwa ka ụmụ Livaị dị ọcha;+ ọ ga-anụcha ha dị ka ọlaedo,+ nụchaakwa ha dị ka ọlaọcha, ha ga-aghọkwara Jehova ndị na-eweta onyinye inweta ihu ọma+ n’ezi omume.
7 ka okwukwe unu nke a nwalere anwale,+ nke bara oké uru karịa ọlaedo nke na-ala n’iyi, n’agbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya,+ wee bụrụ ihe na-eweta otuto na ebube na nsọpụrụ mgbe a ga-ekpughe+ Jizọs Kraịst.