7 N’ihi na ụlọ Izrel bụ ubi vaịn+ Jehova nke ụsụụ ndị agha, ndị Juda bụkwa ubi nke na-eme ya obi ụtọ.+ O wee na-atụ anya ikpe ziri ezi,+ ma, lee! ọ bụ mmebi iwu ka ọ hụrụ; ọ tụrụ anya ezi omume, ma, lee! ọ bụ iti mkpu ákwá ka ọ nụrụ.”+
21 Ma mụ onwe m kụrụ gị dị ka ezi mkpụrụ vaịn uhie,+ ọ bụ naanị ezi mkpụrụ vaịn. Oleezi otú i si gbanwee n’ebe m nọ wee ghọọ alaka mebiri emebi nke osisi vaịn si ebe ọzọ?’+
10 “‘N’ime ọbara gị,+ nne gị+ dị ka osisi vaịn nke a kụrụ n’akụkụ mmiri. Ọ ghọrọ osisi na-amị mkpụrụ, nke nwekwara ọtụtụ alaka n’ihi na ọ na-enweta mmiri dị ukwuu.+