Ezikiel
19 “Ma gị onwe gị, bụọ abụ iru uju+ banyere ndị isi Izrel,+ 2 sị, ‘Gịnị ka nne gị bụ? Nne ọdụm n’etiti ọdụm.+ Ọ makpu n’etiti ụmụ ọdụm tojuru etoju. Ọ zụlitere ụmụ ya.
3 “‘O ji nwayọọ nwayọọ zụlite otu n’ime ụmụ ya.+ O wee ghọọ nwa ọdụm tojuru etoju, malitekwa ịmụ otú e si adọgbu anụ.+ O riri ọbụna mmadụ. 4 Mba dị iche iche wee na-anụ banyere ya. E jidere ya n’olulu ha, ha wee jiri nko dọkpụrụ ya gaa n’ala Ijipt.+
5 “‘Mgbe o chegidere wee hụ na ya enwekwaghị olileanya ya, o weere nwa ya ọzọ.+ Ọ zụlitekwara ya, o wee ghọọ nwa ọdụm tojuru etoju. 6 O wee na-ejegharị n’etiti ọdụm. Ọ ghọrọ nwa ọdụm tojuru etoju. O wee jiri nwayọọ nwayọọ mụta ka e si adọgbu anụ.+ O riri ọbụna mmadụ.+ 7 O wee mata ụlọ elu o bi, ọ lakwara ọbụna obodo ha n’iyi,+ ala ahụ wee tọgbọrọ n’efu, o mekwara ka a nụ mbigbọ+ ya n’ala ahụ dum. 8 Mba niile ndị gbara ya gburugburu, bụ́ ndị si n’ógbè dị iche iche, malitere ịbịa ka ha megide ya,+ gbasaakwa ụgbụ ha n’elu ya.+ Ha jidere ya n’olulu ha.+ 9 N’ikpeazụ, ha ji nko dọrọ ya dọba n’ime ngịga wee buru ya butere eze Babịlọn.+ Ha wee jiri ụgbụ e ji achụ nta bute ya, ka a ghara ịnụ olu ya ọzọ n’ugwu niile dị n’Izrel.+
10 “‘N’ime ọbara gị,+ nne gị+ dị ka osisi vaịn nke a kụrụ n’akụkụ mmiri. Ọ ghọrọ osisi na-amị mkpụrụ, nke nwekwara ọtụtụ alaka n’ihi na ọ na-enweta mmiri dị ukwuu.+ 11 Ha wee ghọọrọ ya mkpanaka siri ike, bụ́ mkpanaka nke ndị na-achị achị.+ O wee jiri nwayọọ nwayọọ tokarịa alaka osisi ndị ọzọ, e wee na-ahụ ya anya n’ihi ogologo o toro, n’ihi na alaka ya dị ọtụtụ.+ 12 Ma e mesịrị jiri iwe fopu ya.+ A tụsara ya n’ala, ifufe nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ mekwara ka mkpụrụ ya kpọọ nkụ.+ A gbajipụrụ mkpanaka ya siri ike, o wee kpọnwụọ.+ Ọkụ repịakwara ya.+ 13 A kụkwara ya n’ala ịkpa,+ n’ala mmiri na-adịghị, nke kpọkwara nkụ.+ 14 Ọkụ wee si na mkpanaka ya pụta.+ O repịara alaka ya na mkpụrụ ya. O nweghịkwa mkpanaka siri ike, mkpanaka e ji achị achị adịghịkwa.+
“‘Nke ahụ bụ abụ iru uju, ọ ga-aghọkwa abụ iru uju.’”+