10 “N’ụbọchị unu na-aṅụrị ọṅụ+ nakwa n’oge ememme+ unu nakwa ná mbido ọnwa unu,+ unu ga-afụ opi maka àjà nsure ọkụ+ unu nakwa àjà udo unu;+ ịfụ ha ga-abụrụ unu ihe ncheta n’ihu Chineke unu. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.”+
27 Hezekaya wee kwuo ka a chụọ àjà nsure ọkụ n’elu ebe ịchụàjà; mgbe a malitere ịchụ àjà nsure ọkụ ahụ, a malitere ịbụ abụ+ Jehova, a malitekwara ịfụ opi ndị ahụ ka ha na abụ e ji ngwá egwú Devid eze Izrel na-abụ na-adakọ.