21 Ya na ndị ya gbakwara izu,+ o wee mee ka e nwee ndị ga na-abụku Jehova abụ+ na ndị yi uwe mara mma nke dị nsọ+ wee na-enye otuto+ mgbe ha na-aga n’ihu ndị agha+ ahụ, na-asị: “Nyenụ Jehova otuto,+ n’ihi na obiọma* ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”+
18 Jehoyada nyefekwara ọrụ ndị dị n’ụlọ Jehova n’aka ndị nchụàjà na ndị Livaị, bụ́ ndị Devid+ kere n’ìgwè n’ìgwè ilekọta ụlọ Jehova ka ha wee na-achụ àjà nsure ọkụ Jehova dị ka ihe e dere n’iwu Mozis si dị,+ jirikwa ịṅụrị ọṅụ na abụ na-eme nke ahụ dị ka ntụziaka Devid si dị.