25 Ka nke a na-eme, o mere ka ndị Livaị+ jiri ájà+ na ụbọ akwara+ na une+ guzoro n’ụlọ Jehova, dị ka Devid+ na Gad+ bụ́ onye ọhụụ eze nakwa Netan+ onye amụma nyere n’iwu, n’ihi na ọ bụ Jehova nyere iwu ahụ site n’ọnụ ndị amụma ya.+
10 Mgbe ndị ahụ na-ewu ụlọ tọrọ ntọala+ ụlọ nsọ Jehova, ndị nchụàjà, bụ́ ndị yi uwe ndị nchụàjà+ ma jiri opi,+ na ndị Livaị bụ́ ụmụ Esaf,+ ndị ji ájà,+ biliri ito Jehova dị ka ntụziaka Devid bụ́ eze Izrel nyere si dị.+
27 Mgbe a na-arara mgbidi Jeruselem nye,+ ha chọrọ ndị Livaị, ime ka ha si n’ebe niile ha nọ bịa Jeruselem ime ememme nraranye na iji ọṅụ na-enye ekele,+ na iji ájà, ụbọ akwara+ na une+ na-abụ abụ.+