Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọnụ Ọgụgụ 14:18
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 18 ‘Jehova, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ onye obiọma* ya dị ukwuu,+ onye na-agbaghara njehie na mmebi iwu,+ ma ọ gaghị anwa anwa hapụ inye ntaramahụhụ,+ ọ na-enye ndị bụ́ ụmụ ntaramahụhụ maka njehie ndị nna ha, na-enyekwa ọgbọ nke atọ na ọgbọ nke anọ.’+

  • Diuterọnọmi 5:10
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 10 ma na-egosi ọbụna otu puku ọgbọ obiọma,* ma ọ bụrụ ndị hụrụ m n’anya ma na-edebe ihe m nyere n’iwu.+

  • Nehemaya 9:17
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 17 Ha wee jụ ige ntị,+ ha echetaghịkwa+ ọrụ ebube gị niile ị rụụrụ ha, kama ha kwesiri olu ike+ wee họpụta onye ndú+ iji laghachi n’agbụ n’Ijipt. Ma ị bụ Chineke nke na-agbaghara mmehie,+ onye na-eme amara,+ na-emekwa ebere,+ onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ+ na onye obiọma* ya dị ukwuu,+ ị hapụghịkwa ha.+

  • Abụ Ọma 86:15
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 15 Ma gị onwe gị, Jehova, bụ Chineke nke na-eme ebere, onye na-eme amara,+

      Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu.+

  • Jeremaya 32:18
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 18 gị Onye na-egosi ọtụtụ puku mmadụ obiọma,*+ onye na-ewere ụgwọ njehie nke ndị bụ́ nna kwụọ ụmụ ha* ndị ga-anọchi ha,+ gị ezi Chineke, Onye ukwu,+ Dike,+ Jehova nke ụsụụ ndị agha+ bụ aha gị,+

  • Joel 2:13
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 13 Dọwaakwanụ obi unu,+ ọ bụghị uwe unu;+ lọghachikwutenụ Jehova bụ́ Chineke unu, n’ihi na ọ na-eme amara, na-emekwa ebere,+ ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ obiọma*+ ya dịkwa ukwuu, ọdachi ahụ ga-ewutekwa ya.+

  • Jona 4:2
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 2 O wee kpekuo Jehova ekpere, sị: “Ewoo, Jehova, ọ́ bụghị ihe a ka m nọ na-eche, mgbe m nọ n’ala m? Ọ bụ ya mere m ji gbagawa Tashish;+ n’ihi na m maara na ị bụ Chineke nke na-eme amara, onye na-eme ebere,+ onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye obiọma* ya dị ukwuu,+ onye na-agbanwekwa obi ya wee ghara iweta ọdachi.+

  • Nehọm 1:3
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 3 Jehova adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ ike+ ya dịkwa ukwuu, Jehova agaghịkwa ala azụ ma ọlị n’inye ntaramahụhụ.+

      N’ifufe na-ebibi ihe nakwa n’oké ifufe mmiri ka ụzọ ya dị, ígwé ojii dịkwa ka uzuzu nke ụkwụ+ ya bọliri.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya