Job 16:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Ha emeghepụwo ọnụ ha megide m,+Ha amawo m ụra iji kọchaa m,Ha agbakọtawo n’ìgwè megide m.+ Abụ Ọma 35:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 Ha na-emeghe ọnụ ha megide m.+Ha sịrị: “Ntọọ! Ntọọ! anya anyị ahụwo ya.”+ Abụ Ákwá 2:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 Ndị iro gị niile emeghewo ọnụ ha megide gị.+Ha afụwo mkpọrọhịhị, na-atakwa ikikere ezé.+ Ha asịwo: “Anyị ga-eloda ya.+Taa bụ n’ezie ụbọchị anyị nọ na-atụ anya ya.+ Anyị enwetawo ya! Anyị ahụwo ya!”+ Matiu 26:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 ma gbaa izu+ iji ụzọ akọ jide Jizọs ma gbuo ya.
16 Ndị iro gị niile emeghewo ọnụ ha megide gị.+Ha afụwo mkpọrọhịhị, na-atakwa ikikere ezé.+ Ha asịwo: “Anyị ga-eloda ya.+Taa bụ n’ezie ụbọchị anyị nọ na-atụ anya ya.+ Anyị enwetawo ya! Anyị ahụwo ya!”+