11 Jehova, gị onwe gị nwe ịdị ukwuu+ na ike+ na ịma mma+ na ebube+ na nsọpụrụ;+ n’ihi na ihe niile dị n’eluigwe na n’elu ụwa bụ nke gị.+ Jehova, Onye na-emekwa onwe ya ka ọ dị elu dị ka onyeisi nke mmadụ niile,+ ọ bụ gị nwe alaeze.+
5 M wee sị: “Efuola m! N’ihi na ọ fọrọ nke nta ka m nwụọ, n’ihi na abụ m onye egbugbere ọnụ ya na-adịghị ọcha,+ ọ bụkwa n’etiti ndị egbugbere ọnụ ha na-adịghị ọcha ka m bi;+ n’ihi na anya m ahụwo Eze bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha!”+