10 Unu ga-agafekwa Jọdan+ ma biri n’ala ahụ nke Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu,+ ọ ga-emekwa ka unu zuoro ndị iro niile gbara unu gburugburu ike, unu ga-ebikwa n’obi iru ala.+
25 “‘“Mụ na ha ga-agba ọgbụgba ndụ udo,+ m ga-emekwa ka ajọ anụ ọhịa ghara ịdịkwa n’ala ha,+ ha ga-ebikwa n’ala ịkpa n’obi iru ala, hiekwa ụra n’oké ọhịa.+