12 Ha ga-abịa tie mkpu ọṅụ n’ebe dị elu na Zayọn,+ ihu ha ga na-egbuke egbuke n’ihi ịdị mma Jehova,+ n’ihi ọka* na mmanya ọhụrụ+ na mmanụ na ụmụ ìgwè ewu na atụrụ na ụmụ ehi.+ Mkpụrụ obi ha ga-adịkwa ka ubi mmiri na-ede nke ọma,+ ha agakwaghị ahụsi anya ọzọ.”+
27 Rụọnụ ọrụ, ọ bụghị iji nweta nri nke na-ala n’iyi,+ kama iji nweta nri na-adịgide adịgide nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi,+ bụ́ nke Nwa nke mmadụ ga-enye unu; n’ihi na ọ bụ ya ka Nna m, bụ́ Chineke, kara akara nke na-egosi na ihe ya masịrị ya.”+
17 Mmụọ nsọ+ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ+ na-asị: “Bịa!” Onye ọ bụla nke nụrụ ya, ya sịkwa: “Bịa!”+ Onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịakwa;+ onye ọ bụla nke chọrọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.+