21 Ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume;+ ha ga-enweta ala a ruo mgbe ebighị ebi,+ ha bụ ome nke ihe m kụrụ,+ ihe aka m rụrụ,+ ka e wee mee ka m maa mma.+
8 Ọ ga-adị ka osisi a kụrụ n’akụkụ mmiri, nke gbanyere mgbọrọgwụ n’akụkụ ọwa mmiri; ọ gaghịkwa ahụ mgbe okpomọkụ bịara, kama akwụkwọ ya ga na-ama pokopoko.+ Ọ gaghị echegbu onwe ya n’afọ e nwere ụkọ mmiri ozuzo,+ ọ gaghịkwa akwụsị ịmị mkpụrụ.