Abụ Ọma
AKWỤKWỌ NKE MBỤ
(Abụ Ọma 1 ruo 41)
1 Obi ụtọ na-adịrị+ onye na-adịghị eje ije na ndụmọdụ ndị ajọ omume,+
Onye na-adịghịkwa eso ụzọ ndị mmehie,+
Onye na-adịghịkwa anọ n’etiti ndị na-akwa emo.+
3 Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,+
Nke na-amị mkpụrụ ya n’oge ya,+
Akwụkwọ ya adịghịkwa akpọnwụ akpọnwụ,+
Ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.+