13 Ma ọ sịrị ya: “Onyenwe m maara na ụmụaka a esighị ike, m na-elekọtakwa atụrụ na ehi na-enye ụmụ ha ara,+ ọ bụrụkwa na a chịa ha n’ike ruo otu ụbọchị, ìgwè anụ ụlọ a dum ga-anwụ.+
12 “Ụbọchị isii ka ị ga-arụ ọrụ gị;+ ma n’ụbọchị nke asaa, arụla ọrụ, ka ehi gị na ịnyịnya ibu gị wee zuo ike, ka nwa ohu gị nwaanyị na onye mbịarambịa wee nweta ume.+
11 Ọ̀ bụ na mụ onwe m ekwesịghị imere Ninive bụ́ obodo ukwu ebere,+ bụ́ ebe e nwere ihe karịrị otu narị puku mmadụ na puku iri abụọ, bụ́ ndị na-amaghị ma ọlị ihe dị iche n’aka nri ha na aka ekpe ha, n’agụnyeghị ọtụtụ anụ ụlọ?”+