24 N’ihi na m ga-achụpụ mba dị iche iche n’ihu gị,+ m ga-emekwa ka ókèala gị saa mbara;+ ọ dịghịkwa onye ọ ga-agụ agụụ iwere ala gị mgbe ị na-agbago ịhụ ihu Jehova bụ́ Chineke gị ugboro atọ n’afọ.+
11 Jehova kwuru, sị: “N’ezie, m ga-emere gị ihe ọma.+ N’ezie, m ga-agbachitere gị n’oge ọdachi+ nakwa n’oge ahụhụ ka onye iro ghara ime gị ihe ọ bụla.+