Abụ Ọma 39:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 N’ezie, mmadụ na-ejegharị dị ka onyinyo.+N’ezie, ha na-eme mkpọtụ na nkịtị.+Mmadụ na-akpakọ akụ̀ n’amaghị onye ọ ga-ahapụrụ ya.+ Ekliziastis 2:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Mụ onwe m kpọkwara ọrụ niile m nọ na-arụsi ike n’okpuru anyanwụ asị,+ nke bụ́ ihe m ga-ahapụrụ onye ga-anọchi m.+ Ekliziastis 8:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Ihe a dum ka m hụworo, m wee jiri obi m tụlee ọrụ niile a rụworo n’okpuru anyanwụ, n’oge mmadụ chịworo mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.+ Ekliziastis 9:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Nke a bụ ọdachi dị n’ihe niile e meworo n’okpuru anyanwụ, na obi ụmụ mmadụ jupụtara n’ihe ọjọọ+ n’ihi na ọ bụ otu ihe ndabara ahụ na-adabara mmadụ niile;+ nzuzu+ dịkwa n’obi ha n’oge ndụ ha, ya gasịa, ha aghọọ ndị nwụrụ anwụ!+
6 N’ezie, mmadụ na-ejegharị dị ka onyinyo.+N’ezie, ha na-eme mkpọtụ na nkịtị.+Mmadụ na-akpakọ akụ̀ n’amaghị onye ọ ga-ahapụrụ ya.+
18 Mụ onwe m kpọkwara ọrụ niile m nọ na-arụsi ike n’okpuru anyanwụ asị,+ nke bụ́ ihe m ga-ahapụrụ onye ga-anọchi m.+
9 Ihe a dum ka m hụworo, m wee jiri obi m tụlee ọrụ niile a rụworo n’okpuru anyanwụ, n’oge mmadụ chịworo mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.+
3 Nke a bụ ọdachi dị n’ihe niile e meworo n’okpuru anyanwụ, na obi ụmụ mmadụ jupụtara n’ihe ọjọọ+ n’ihi na ọ bụ otu ihe ndabara ahụ na-adabara mmadụ niile;+ nzuzu+ dịkwa n’obi ha n’oge ndụ ha, ya gasịa, ha aghọọ ndị nwụrụ anwụ!+