2 Ihe E Mere 9:31 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 N’ikpeazụ, Sọlọmọn sooro nna nna ya hà dinaa. Ha wee lie ya n’Obodo Devid nna ya;+ Rehoboam+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.+ Ekliziastis 2:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Mụ onwe m kpọkwara ọrụ niile m nọ na-arụsi ike n’okpuru anyanwụ asị,+ nke bụ́ ihe m ga-ahapụrụ onye ga-anọchi m.+ Ekliziastis 5:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Dị nnọọ ka mmadụ gba ọtọ si n’afọ nne ya pụta, ọtọ ka ọ ga-agbakwa laa,+ dị nnọọ ka ọ gba pụta; ọ dịghịkwa ihe ọ bụla mmadụ pụrụ iwere laa,+ ọ dịghị ihe ọ pụrụ iji laa n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya.
31 N’ikpeazụ, Sọlọmọn sooro nna nna ya hà dinaa. Ha wee lie ya n’Obodo Devid nna ya;+ Rehoboam+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.+
18 Mụ onwe m kpọkwara ọrụ niile m nọ na-arụsi ike n’okpuru anyanwụ asị,+ nke bụ́ ihe m ga-ahapụrụ onye ga-anọchi m.+
15 Dị nnọọ ka mmadụ gba ọtọ si n’afọ nne ya pụta, ọtọ ka ọ ga-agbakwa laa,+ dị nnọọ ka ọ gba pụta; ọ dịghịkwa ihe ọ bụla mmadụ pụrụ iwere laa,+ ọ dịghị ihe ọ pụrụ iji laa n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya.