2 Ọtụtụ mba ga-ejekwa, sị: “Bịanụ+ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova, n’ụlọ Chineke nke Jekọb;+ ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya,+ anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”+ N’ihi na ọ bụ na Zayọn ka iwu ga-esi pụta, okwu Jehova ga-esikwa na Jeruselem pụta.+
33 Ya mere, m ziri ozi ozugbo ka a kpọọ gị, i mekwara nke ọma wee bịa ebe a. N’ihi ya, anyị niile nọ ugbu a n’ihu Chineke ịnụ ihe niile Jehova nyere gị iwu ka i kwuo.”+
9 Otú ọ dị, n’ihe banyere ịhụnanya ụmụnna,+ ọ dịghị unu mkpa ka anyị na-edetara unu akwụkwọ, n’ihi na unu onwe unu bụ ndị Chineke na-akụziri+ ịhụrịta ibe unu n’anya;+