3 Ọtụtụ ndị ga-ejekwa wee sị: “Bịanụ+ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova, n’ụlọ Chineke nke Jekọb; ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya, anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”+ N’ihi na ọ bụ na Zayọn ka iwu ga-esi pụta, okwu Jehova ga-esikwa na Jeruselem pụta.+
6 Ọ bụkwa n’ugwu a+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emere ndị niile+ oké oriri nke ihe mara abụba,+ oké oriri nke ezigbo mmanya doro edo, nke ihe mara abụba nke ụmị jupụtara na ya,+ nke ezigbo mmanya+ doro edo, nke a zara aza.+
52Teta, teta, yiri ike gị dị ka uwe,+ gị Zayọn! Yiri uwe gị mara mma,+ gị Jeruselem, bụ́ obodo nsọ!+ N’ihi na onye a na-ebighị úgwù na onye na-adịghị ọcha agaghị abata n’ime gị ọzọ.+
17 N’oge ahụ, ha ga-akpọ Jeruselem ocheeze Jehova;+ a ga-akpọkọta+ mba niile n’ime Jeruselem+ ka ha too aha Jehova n’ebe ahụ, ha agakwaghị eje ije dị ka isi ike nke dị n’ajọ obi ha si dị.”+