13 Tie mkpu ọṅụ, gị eluigwe,+ ṅụrịa ọṅụ, gị ụwa.+ Ka ugwu niile tie mkpu ọṅụ.+ N’ihi na Jehova akasiwo ndị ya obi,+ ọ na-emere ndị ya ọ na-enweghị ka ọ hà ha ọmịiko.+
3 N’ihi na Jehova ga-akasi Zayọn obi.+ Ọ ga-akasikwa ebe ya niile tọgbọrọ n’efu obi,+ ọ ga-eme ka ala ịkpa ya dị ka Iden,+ meekwa ka mbara ọzara ya dị ka ubi Jehova.+ Obi ụtọ na ọṅụ ga-adị n’ime ya, a ga na-anụkwa ekele na abụ olu ụtọ n’ime ya.+