9 gị onye m jidere aka site na nsọtụ niile nke ụwa,+ gị onwe gị kwa, bụ́ onye m kpọworo ọbụna site n’ime ime ụwa.+ M wee sị gị, ‘Ị bụ ohu m;+ ahọrọwo m gị,+ ajụghị m gị ajụ.+
10 Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ.+ Bụọnụ otuto ya n’abụ site na nsọtụ ụwa,+ unu ndị na-agbada n’oké osimiri+ na n’ihe jupụtara n’ime ya, unu agwaetiti na unu ndị bi na ha.+