37 “Ugbu a, mụ onwe m, Nebukadneza, na-eto ma na-ebuli Eze eluigwe elu, na-ajakwa ya mma,+ n’ihi na ọrụ ya niile bụ eziokwu, ụzọ ya niile bụkwa ikpe ziri ezi,+ nakwa n’ihi na o nwere ike iweda ndị ji mpako na-eje ije ala.”+
9 Ònye maara ihe, ka o wee ghọta ihe ndị a?+ Ònye nwere uche, ka o wee mara ha?+ N’ihi na ụzọ Jehova ziri ezi,+ ọ bụ ndị ezi omume ga na-eje ije na ya;+ ma ndị na-emebi iwu ga-asụ ngọngọ na ya.+