2 Ọ ghaghị ịwa okooko,+ ọ ga-aṅụrịkwa ọṅụ nke ukwuu, tiekwa mkpu ọṅụ.+ A ga-enye ya ebube nke Lebanọn,+ na ịma mma nke Kamel+ na nke Sharọn.+ A ga-enwe ndị ga-ahụ ebube Jehova,+ bụ́ ịma mma nke Chineke anyị.+
19 M ga-eme ka osisi sida na osisi akeshịa na osisi metụl na osisi mmanụ dịrị n’ala ịkpa.+ M ga-eme ka osisi junipa na osisi ash na osisi saịpres dịrị na mbara ọzara n’otu mgbe ahụ;+
13 Osisi junipa ga-anọchi osisi ogwu.+ Osisi metụl ga-anọchikwa ahịhịa akụwa.+ Ọ ga-aghọ ihe ga-eme ka aha Jehova na-ede ude,+ ihe ịrịba ama nke ga-adịru mgbe ebighị ebi,+ nke a na-agaghị ebipụ ebipụ.”