11 N’ihi na dị ka ala si eme ka ihe puo, dịkwa ka ubi si eme ka ihe a kụrụ na ya puo,+ otú ahụ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-eme ka ezi omume na otuto puo+ n’ihu mba niile.+
9 Obodo a ga-aghọrọ m aha na-enye ọṅụ,+ otuto na ịma mma n’ebe mba niile nke ụwa nọ, bụ́ ndị ga-anụ banyere ihe ọma niile m na-emere ha.+ Ha ga-atụ ụjọ,+ maakwa jijiji+ n’ihi ihe ọma niile m na-emere ya na udo niile m na-ewetara ya.’”+
19 Lee, n’oge ahụ, m ga-eme ihe megide ndị niile na-emekpa gị ahụ́;+ m ga-azọpụta onye na-ete ụkwụ,+ m ga-achịkọtakwa ndị a chụsara achụsa.+ M ga-emekwa ka ha nwee otuto na aha n’ala dum e mere ha ihe ihere.