11 Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na Jehova ga-esetị aka ya ọzọ, nke ugboro abụọ,+ inweta ndị fọdụrụ n’etiti ndị ya, bụ́ ndị ga-afọdụ site n’Asiria+ na Ijipt+ na Patrọs+ na Kush+ na Ilam+ na Shaịna+ na Hemat nakwa agwaetiti nke oké osimiri.+
12 Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na Jehova ga-akụtusị mkpụrụ dị na ya,+ malite na mmiri na-asọ asọ nke Osimiri Yufretis+ ruo na ndagwurugwu Ijipt,+ a ga-atụtụtakwa unu otu otu,+ unu ụmụ Izrel.
25 “‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Mgbe m ga-akpọkọta ụlọ Izrel site n’etiti ndị dị iche iche bụ́ ebe a chụsasịrị ha,+ a ga-edokwa m nsọ n’etiti ha n’ihu mba dị iche iche.+ Ha ga-anọkwa n’ala ha+ nke m nyere ohu m Jekọb.+
14 M ga-akpọkọta ndị a dọọrọ n’agha n’ime ndị m Izrel.+ Ha ga-ewukwa ebe ndị tọgbọrọ n’efu ma biri n’ime ha,+ kọọ ubi vaịn ma ṅụọ mmanya ha, kọọkwa ubi ma rie mkpụrụ ha.’+
7 M ga-emekwa ka ndị ahụ na-ete ụkwụ fọdụ,+ meekwa ka ndị ahụ a chịgara n’ebe dị anya bụrụ mba dị ike;+ Jehova ga-achịkwa ha dị ka eze n’Ugwu Zayọn, malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.+