21 Ọ ga-erukwa na mgbe ọtụtụ ọdachi na ahụhụ ga-adakwasị ha,+ abụ a ga-aza n’ihu ha dị ka onye akaebe, n’ihi na a gaghị echefu ya echefu n’ọnụ ụmụ ha, n’ihi na amaara m nke ọma ọchịchọ ha+ malitere inwe taa tupu mụ akpọba ha n’ala ahụ m ṅụrụ iyi inye ha.”
7 Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya,+ ka onye ọjọọ kwụsị iche echiche ọjọọ ya.+ Ya laghachikwuru Jehova, bụ́ onye ga-emere ya ebere,+ ya laghachikwuru Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụzọ dị ukwuu.+
2“Ahụhụ ga-adịrị ndị na-akpa nkata ihe ọjọọ, na-emekwa atụmatụ otú ha ga-esi mee ihe na-adịghị mma mgbe ha dina n’elu ihe ndina ha!+ Ha na-eme ya mgbe chi bọrọ,+ n’ihi na ha nwere ike ime ya.+