3 Onye ọ bụla n’ime unu, n’etiti ndị ya niile, ka Chineke ya nọnyere ya.+ Ya lawa Jeruselem, nke dị na Juda, ma wughachi ụlọ Jehova bụ́ Chineke Izrel—ọ bụ ya bụ ezi Chineke+—bụ́ ụlọ dị na Jeruselem.+
9 Mgbe unu laghachikwutere m,+ debekwa ihe niile m nyere n’iwu+ ma mee ha,+ ọ bụrụgodị na ndị unu a chụsasịrị achụsasị nọ na nsọtụ eluigwe, m ga-esi n’ebe ahụ chịkọta+ ha, kpọlatakwa ha+ n’ebe ahụ m họọrọ ime ka aha m biri na ya.’+