Diuterọnọmi 30:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Jehova bụ́ Chineke gị ga-akpọghachite ndị gị a dọọrọ n’agha+ wee meere gị ebere+ ma si n’etiti ndị niile Jehova bụ́ Chineke gị chụsasịrị gị kpọghachite gị.+ Abụ Ọma 30:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 N’ihi na ọ bụ ruo nwa oge ka ọ na-eweso mmadụ iwe,+Ọ na-emere mmadụ amara n’oge ndụ ya niile.+Ịkwa ákwá pụrụ ịdị n’anyasị,+ ma o ruo n’ụtụtụ, e nwee mkpu ọṅụ.+ Abụ Ọma 85:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 85 Jehova, ala gị na-eme gị obi ụtọ;+Ị kpọghachitewo ndị Jekọb a dọọrọ n’agha.+ Aịzaya 66:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Dị ka nwoke nke nne ya na-akasi obi, otú ahụ ka mụ onwe m ga na-akasi unu obi;+ a ga-akasi unu obi n’ihe banyere Jeruselem.+ Hosia 6:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 “Bịanụ, ka anyị laghachikwuru Jehova,+ n’ihi na ya onwe ya adọrisịwo anyị,+ ma ọ ga-agwọ anyị.+ Ọ nọ na-eti anyị ihe, ma ọ ga-ekechi ọnyá anyị.+
3 Jehova bụ́ Chineke gị ga-akpọghachite ndị gị a dọọrọ n’agha+ wee meere gị ebere+ ma si n’etiti ndị niile Jehova bụ́ Chineke gị chụsasịrị gị kpọghachite gị.+
5 N’ihi na ọ bụ ruo nwa oge ka ọ na-eweso mmadụ iwe,+Ọ na-emere mmadụ amara n’oge ndụ ya niile.+Ịkwa ákwá pụrụ ịdị n’anyasị,+ ma o ruo n’ụtụtụ, e nwee mkpu ọṅụ.+
13 Dị ka nwoke nke nne ya na-akasi obi, otú ahụ ka mụ onwe m ga na-akasi unu obi;+ a ga-akasi unu obi n’ihe banyere Jeruselem.+
6 “Bịanụ, ka anyị laghachikwuru Jehova,+ n’ihi na ya onwe ya adọrisịwo anyị,+ ma ọ ga-agwọ anyị.+ Ọ nọ na-eti anyị ihe, ma ọ ga-ekechi ọnyá anyị.+