Maka onye nduzi. Abụ ọma ụmụ Kora. Abụ olu ụtọ.
85 Jehova, ala gị na-eme gị obi ụtọ;+
Ị kpọghachitewo ndị Jekọb a dọọrọ n’agha.+
2 Ị gbagharawo njehie nke ndị gị;+
I kpuchiwo mmehie ha dum.+ Sila.
3 Ị chịkwawo iwe gị dum;+
Ị kwụsịwo iwe gị dị ọkụ.+
4 Chineke nke nzọpụta anyị, biko, kpọghachite anyị, +
Kwụsịkwa iwe ị na-eweso anyị.+
5 Ọ̀ bụ ruo mgbe ebighị ebi ka ị ga na-eweso anyị oké iwe?+
Ị̀ ga na-eweso anyị iwe site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ?+
6 Ọ̀ bụ na ị gaghị eme ka anyị dị ndụ ọzọ,+
Ka ndị gị wee ṅụrịa ọṅụ n’ime gị?+
7 Jehova, biko, gosi anyị obiọma gị,+
Nyekwa anyị nzọpụta gị.+
8 M ga-anụ ihe ezi Chineke bụ́ Jehova ga-ekwu,+
N’ihi na ọ ga-agwa ndị ya okwu udo,+ gwakwa ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ,
Ma ka ha ghara ịlaghachi n’ịtụkwasị onwe ha obi.+
9 N’ezie, nzọpụta ya dị ndị na-atụ egwu ya nso,+
Ka ebube ya wee dị n’ala anyị.+
10 Ma obiọma na eziokwu ezutewo;+
Ezi omume na udo esusuwo ọnụ.+
11 Eziokwu ga-esi n’ala pulite,+
Ezi omume ga-esikwa n’eluigwe ledata anya.+
12 Jehova ga-enyekwa ihe dị mma,+
Ala anyị ga-emepụta ihe nke ọma.+
13 Ezi omume ga-eje ije n’ihu ya,+
Ọ ga-awakwa ụzọ n’ebe Chineke zọrọ ụkwụ.+