2Ndị a bụ ndị si n’ógbè a na-achị achị,+ bụ́ ndị si n’etiti ndị a dọọrọ n’agha+ lọta, ndị Nebukadneza eze Babịlọn dọọrọ n’agha+ laa Babịlọn, ndị mesịkwara lọta+ Jeruselem na Juda,+ onye nke ọ bụla n’obodo nke ya;
18 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m ga-achịkọta ndị e si n’ụlọikwuu Jekọb dọrọ n’agha,+ m ga-enwere ụlọikwuu ya dị nsọ ọmịiko. A ga-ewughachi obodo ya ná mkputamkpu ala ya;+ ụlọ elu ya ga-adịkwa n’ebe o kwesịrị ịdị.+
23 Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Ha ka ga-ekwu okwu a n’ala Juda nakwa n’obodo ndị dị n’ime ya, mgbe m ga-akpọkọta ndị ha a dọọrọ n’agha, sị, ‘Ka Jehova gọzie gị,+ gị ebe obibi ezi omume,+ gị ugwu nsọ.’+
25 “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ugbu a ka m ga-akpọghachite ndị Jekọb+ a dọọrọ n’agha, meekwara ụlọ Izrel dum ebere.+ M ga-ekworo aha nsọ m ekworo.+