13 Tie mkpu ọṅụ, gị eluigwe,+ ṅụrịa ọṅụ, gị ụwa.+ Ka ugwu niile tie mkpu ọṅụ.+ N’ihi na Jehova akasiwo ndị ya obi,+ ọ na-emere ndị ya ọ na-enweghị ka ọ hà ha ọmịiko.+
48 “Eluigwe na ụwa na ndị niile nọ n’ime ha ga-eti mkpu ọṅụ n’ihi Babịlọn,+ n’ihi na ndị na-ebukọrọ ihe mmadụ ga-esi n’ebe ugwu bịa na ya,”+ ka Jehova kwuru.
20 “Ṅụrịa ọṅụ, gị eluigwe,+ na unu ndị nsọ+ na unu ndịozi+ na unu ndị amụma n’ihi ihe mere ya, n’ihi na Chineke amawo ya ikpe ma nye ya ntaramahụhụ n’ihi unu!”+